Christian Science Bible Lessons in Igbo

Gbasara Omumu Akwukwo Nso

Akwukwo Nso di ezigbo mkpa n’ime Christian Science. Mary Baker Eddy, onye nke malitere Christian Science tinyere uchu na nghota akwukwo nso oge obu nwatakiri, ma guokwa zia ya nke oma, dika okenye. Site na nghota akwukwo nso a, o choputara n’ime ndu ya onweya n’ike niile gbasara igwo oria di na-aka Chukwu. Nke a gbara ya ume, imu edemede niile nke akwukwo nso nke oma, ya na ichoputa maa ghota ihe omimi ya putara dika Chukwu si cho. Nke a nyere ya amamihe oji dee akwukwo nke Science and Health with Key to the Scriptures. Akwukwo Nso na Science and Health ka otere manu ibu onye ozuzu aturu nke uka Christian Science.

Ndi Christian Science n’esoro uzo ukpuru uzo nkea puru iche Eddy gosiri na-imu ihe omumu, ya na ilebe anya na-eziokwu di n’ime akwukwo nso. Omumu Akwukwo Nso di oke nkpa n’ihe omumua. Ihe omumu obula ana- eweputa, sitere na-Akwukwo Nso, nwere nkowa ya site na Science and Health. Ahaziri ha ofuma na isi-okwu metutara nsogbu ndi mmadu na-agabigha kwa ubochi niile—dika oria, ya na nsogbu enweghi ego,nsogbu di na ejikoghi onu na mmekorita mmadu ibe ya, ya na nsogbu ndi ozo. Ihe ndia bu ihe iwu Chukwu nke akowara n’ime akwukwo nso na-egbochi. Mgbe ndi mmadu huru n’ihe ha na-amuta n’imeihe omumu akwukwo nso a na-enyere ha aka n’uzo puru iche,ha ga –esikwazi etu a ghota na-eziokwu Chukwu nke di n’ihe omumu akwukwo nso a, nwere ike igbochi akparama agwa ojo di iche iche, ya na nsogbu ndi ozo gbara anyi gburu gburu n’uwa niile.

Ihe omumu akwukwo nso bu nkuzi okwu Chukwu kwa ubochi uka obula n’ulo uka Christian Science nke uwa niile.Ige nti maa ghota ihe omumu-a nke oma, ya na-agbamume nke sitere n’ime nghota nkuzi nke izu uka obula, dika o si di n’ihe omumu, ga ewetara anyi onodu ahu isi ike puru iche, nke onye obula no n’okirikiri ahu ga-erita uru ya. Ihe omumu a bukwazi ihe eweputara di oke nkpa anakuzi ndi n’etoeto kwa ubochi uka obula, ebe umu ntorobia na-amu maa n’egosiputa kwa iwu nke Chukwu n’ime ndu ha, I ji nyere ha onwe ha aka, ya na ndi ozo gbara ha gburu gburu aka.

Oge ufodu, ndi mmadu nwere mmasi imu ihe omumu-a na-asusu di iche iche, nke anenwehi akwukwo Science Health na ha. N’ihi nke a, ndi Christian Science Publishing Society nwere ikike inye ndi obula ga-eweputa onwe ha n’efu ike iji hu na-atughariri ihe omumu Akwukwo Nso nke-a site na nke olu bekee ebiputara ka esi cho. Akwukwo Nso sitere na mbipute nke di na asusu okwu ala nke mba obula ebe ntughari Science and Health sitere na nke ebiputara na okwu bekee.

Maka ozi ndị ọzọ gbasara Akwụkwọ Nsọ na Igbo, kpoturu anyi na blptranslations@csps.com.

Maka ihe igba ume ndi ọzọ na ịmu ịhe gbasara Christian Science, ga na christianscience.com/ig.

 

 

Banner: © manusapon kasosod/Moment/Getty Images